16 Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu ka unu ghara imebi, ọ bụrụkwa na unu agaa fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala, Jehova ga-ewesa unu ezigbo iwe.+ Unu ga-alakwa n’iyi ngwa ngwa n’ọmarịcha ala a o nyere unu.”+