-
Joshụa 17:11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 N’Ịsaka nakwa n’Asha, e nyere Manase Bet-shian na ime obodo ndị dị ya nso,* Ibliam+ na ime obodo ndị dị ya nso, ndị bi na Dọọ+ na ime obodo ndị dị Dọọ nso, ndị bi n’En-dọọ+ na ime obodo ndị dị En-dọọ nso, ndị bi na Teanak+ na ime obodo ndị dị Teanak nso, na ndị bi na Megido na ime obodo ndị dị Megido nso. Obodo atọ n’ime obodo ndị a dị n’ugwu.
-
-
Ndị Ikpe 1:27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 Ebo Manase ewegharaghị Bet-shian na ime obodo ndị dị ya nso,* nakwa Teanak+ na ime obodo ndị dị ya nso. Ha achụpụghịkwa ndị bi na Dọọ na ime obodo ndị dị ya nso, ndị bi n’Ibliam na ime obodo ndị dị ya nso, nakwa ndị bi na Megido na ime obodo ndị dị ya nso.+ Ndị Kenan gbara isi akwara biri n’ala a.
-