-
Diuterọnọmi 33:13-15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 O kwuru banyere Josef, sị:+
“Ka Jehova gọzie ala ya.+
Ka o jiri ihe ndị dị mma dị n’eluigwe
Na igirigi na mmiri si n’ala agbapụta gọzie ala ya,+
14 Na ihe ọma dị iche iche anyanwụ na-eme ka ha puo,
Na ihe ọma ndị na-amị n’ọnwa n’ọnwa,+
15 Na ihe kacha mma ndị si n’ugwu ndị dịwara kemgbe oge ochie,*+
Na ihe ọma ndị si n’obere ugwu ndị na-adịte aka,
-
Joshụa 17:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Joshụa asị ụmụ Josef, ya bụ, Ifrem na Manase: “Unu dị ọtụtụ, unu sikwara ezigbo ike. A gaghị ekenye unu naanị otu ala,+ 18 kama unu ga-eketakwa ebe ahụ bụ́ ugwu ugwu.+ Ebe ọ bụ oké ọhịa, sụọnụ ya. Ọ ga-abụkwa ebe ala unu ga-akwụsị. Chụpụnụ ndị Kenan, n’agbanyeghị na ha siri ike, nweekwa ụgbọ ịnyịnya agha ndị a rụnyere ogologo mma n’ụkwụ ha.”*+
-
-
-