19 Ma nna ya ekweghị. Ọ sịrị Josef: “Nwa m, ama m, ama m. Yanwa ga-aghọkwa mba, ọ ga-abụkwa onye ukwu. Ma nwanne ya nke nta ga-aka ya.+ Ụmụ* ya ga-adị nnọọ ọtụtụ nke na ha ga-aghọ ọtụtụ mba.”+
37 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Ifrem. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri atọ na abụọ na narị ise (32,500).+ Ọ bụ ha bụ ụmụ Josef ndị nwoke, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.