8 Ọ gakwaara ruo na Ndagwurugwu Hinọm,+ garakwa ruo ná mkpọda obodo ndị Jebus+ nke dị n’ebe ndịda, ya bụ, Jeruselem.+ Ala ha rukwara n’ugwu dị n’agbata ebe ọdịda anyanwụ Ndagwurugwu Hinọm na ebe Ndagwurugwu Refeyim gwụrụ n’ebe ugwu.
12 N’ebe ọdịda anyanwụ, ala ha kwụsịrị n’Oké Osimiri Mediterenian*+ nakwa n’ala dị n’akụkụ ya. Ebe ndị a niile bụ ókè ala ụmụ Juda, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
3Solomọn mechara bido ịrụ ụlọ Jehova+ na Jeruselem n’Ugwu Moraya.+ N’ebe ahụ ka Jehova pụtara n’ihu Devid nna ya.+ Devid nọkwa ebe ahụ, n’ebe Ọnan+ onye Jebus na-azọcha ọka, kwadebe maka ụlọ nsọ a ga-arụ.