12 Ugbu a, họpụtanụ ụmụ nwoke iri na abụọ n’ebo Izrel niile. Unu ga-esi n’otu ebo họpụta otu onye.+ 13 Ozugbo ọbụ ụkwụ ndị nchụàjà bu Igbe Jehova, bụ́ Onyenwe ụwa niile, ga-azọsa n’Osimiri Jọdan, mmiri si n’ebe mgbago na-asọdata ga-akwụsị ịsọ asọ, kwụrụkwa otu ebe ka mgbidi.”+