19 Ha wee sị: “E nwere ememme a na-emere Jehova kwa afọ na Shaịlo.+ Shaịlo a dị n’ebe ugwu Betel, n’ebe ọwụwa anyanwụ nke okporo ụzọ si Betel gaa Shikem, n’ebe ndịda Lebona.”
12 “‘Ma ugbu a, gaanụ n’ụlọ m dị na Shaịlo,+ bụ́ ebe m họọrọ na mbụ ka a nọrọ na-eto aha m,+ ka unu hụ ihe m mere ya n’ihi ihe ọjọọ ndị Izrel bụ́ ndị m mere.+