14 Unu ga-ahọrọ obodo atọ n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan,+ họrọkwa obodo atọ n’ala Kenan+ ka ha bụrụ obodo mgbaba. 15 Obodo isii ndị a ga-abụrụ ndị Izrel, onye mbịarambịa,+ na onye binyeere ha ebe mgbaba, ebe onye ọ bụla gburu mmadụ n’amaghị ụma ga-agbaga.+