-
Ọnụ Ọgụgụ 35:22-24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 “‘Ma ọ bụrụ na ọ kwara ya aka na mberede, ọ bụghịkwa maka na ọ kpọrọ ya asị, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ tụrụ ya ihe n’eburughị ya iwe n’obi,+ 23 ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ hụghị ya mgbe ọ tụrụ nkume, nkume ahụ atụgbuo onye ahụ, ma ọ bụghị na ọ bụ onye iro ya ma ọ bụ na ọ chọrọ imerụ ya ahụ́, 24 nzukọ unu ga-esoro ntụziaka ndị a kpeere onye ahụ gburu mmadụ na onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ikpe.+
-
-
Diuterọnọmi 19:4-6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Ihe a bụ ihe onye gburu mmadụ, bụ́ onye nwere ike ịgbaga ebe ahụ, ga-eme ka o wee dịrị ndụ: Ọ bụrụ na o gburu mmadụ ibe ya n’amaghị ụma, ya abụrụkwa na ọ kpọbughị onye ahụ asị,+ 5 dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ya na mmadụ ibe ya abanye n’ọhịa ịkpata nkụ, ya ewelie aka ya ka o jiri anyụike gbutuo osisi, ma isi anyụike ahụ efepụ n’osisi ya kụgbuo mmadụ ibe ya, onye ahụ gburu ya kwesịrị ịgbaga n’otu n’ime obodo ndị a ka o wee dịrị ndụ.+ 6 Ma ọ́ bụghị ya, onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ+ nwere ike iji iwe chụwa onye ahụ gburu mmadụ, chụkwute ya ma gbuo ya maka na obodo ọ na-agbaga dị ezigbo anya. Ma, ebe ọ bụ na ọ kpọbughị onye ahụ asị,+ o kwesịghị ịnwụ.
-