Ọpụpụ 9:16 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 16 Ma ihe mere m ji hapụ gị ndụ bụ ka m gosi gị ike m nakwa ka a kọsaa aha m n’ụwa niile.+ Ọpụpụ 15:6 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 6 Jehova, aka nri gị dị ezigbo ike,+Jehova, aka nri gị na-akụri onye iro. Diuterọnọmi 28:10 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 10 Ndị niile bi n’ụwa ga-ahụ na unu na-aza aha Jehova,+ ha ga-atụkwa unu egwu.+ 1 Samuel 17:46 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 46 Jehova ga-enyefe gị n’aka m taa.+ M ga-egbu gị, gbupụkwa gị isi. Ọ bụkwa taa ka m ga-enye ụmụ nnụnụ na anụ ọhịa ozu ndị agha Filistia. Ndị niile bi n’ụwa ga-amakwa na Chi ndị Izrel bụ ezi Chineke.+ 2 Ndị Eze 19:19 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 19 Ma ugbu a, Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, napụta anyị n’aka ya, ka alaeze niile dị n’ụwa mara na ọ bụ naanị gị, Jehova, bụ Chineke.”+ Abụ Ọma 106:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 Ma ọ zọpụtara ha n’ihi aha ya,+Ka o wee mee ka a mara na ọ dị ike.+
46 Jehova ga-enyefe gị n’aka m taa.+ M ga-egbu gị, gbupụkwa gị isi. Ọ bụkwa taa ka m ga-enye ụmụ nnụnụ na anụ ọhịa ozu ndị agha Filistia. Ndị niile bi n’ụwa ga-amakwa na Chi ndị Izrel bụ ezi Chineke.+
19 Ma ugbu a, Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, napụta anyị n’aka ya, ka alaeze niile dị n’ụwa mara na ọ bụ naanị gị, Jehova, bụ Chineke.”+