3 Ọ ga-agwa ha, sị, ‘Ndị Izrel nụrụnụ, unu na-aga ịlụso ndị iro unu agha. Obi amapụla unu. Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ ma ọ bụ maa jijiji n’ihi ha, 4 n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu so unu na-aga. Ọ ga-alụso ndị iro unu agha, zọpụtakwa unu.’+
18 Mgbe ọ bụla Jehova nyere ha onyeikpe,+ Jehova na-anọnyere onyeikpe ahụ ma zọpụta ha n’aka ndị iro ha n’oge niile onyeikpe ahụ nọ ndụ; n’ihi na ọ na-ewute Jehova+ na ndị na-emegide ha na ndị na-echi ha ọnụ n’ala na-eme ka ha na-asụ ude.+