-
1 Ndị Eze 18:26, 27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 Ha wee kpụrụ oké ehi e nyere ha, bọkasịa ya, na-akpọku Bel si n’ụtụtụ ruo n’ehihie, na-asị: “Bel, za anyị!” Ma a nụghị olu ọ bụla, o nweghịkwa onye zara ha.+ Ha nọkwa na-awụgharị gburugburu ebe ịchụàjà ahụ ha rụrụ. 27 N’ehihie, Ịlaịja malitere ịkwa ha emo, sị: “Kpọkusienụ ya ike. Unu manụ na ọ bụ chi.+ Ọ ga-abụ na o nwere ihe na-echegbu ya, ma ọ bụkwanụ na ọ gara mposi.* O nwekwara ike ịbụ na ọ na-arahụ ụra, nke na e kwesịrị ịkpọte ya.”
-