-
Ndị Ikpe 9:16-18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 “Ọ̀ dị mma na unu chiri Abimelek eze?+ Ọ̀ bụ ùgwù ka unu kwanyeere Jerubel? Ọ̀ bụ ihe ọma ka unu meere Jerubel na ezinụlọ ya? Ọ̀ bụ otú a ka unu kwesịrị isi mesoo ya? 17 Mgbe nna m lụụrụ unu agha,+ o mere ihe gaara ata isi ya ka ọ napụta unu n’aka ndị Midian.+ 18 Ma taa, unu agaala lụso ezinụlọ nna m ọgụ ma gbuo ụmụ ya ndị nwoke iri asaa n’elu otu nkume.+ Unu wee chie Abimelek, bụ́ nwa ohu ya nwaanyị,+ eze ka ọ chịwa ndị isi Shikem naanị maka na ọ bụ nwanne unu nwoke.
-