5 Samsịn wee soro nne ya na nna ya gbadaa Timna. Mgbe o ruru n’ubi vaịn ndị dị na Timna, otu ọdụm pụtara na-agbọ ya ụja. 6 Mmụọ Jehova wee mee ka Samsịn dị ike,+ ya adọwaa ọdụm ahụ abụọ, otú mmadụ si eji aka nkịtị adọwa nwa ewu ụzọ abụọ. Ma, ọ gwaghị nne ya ma ọ bụ nna ya ihe o mere.