-
Joshụa 5:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Otu ụbọchị mgbe Joshụa nọ Jeriko nso, o leliri anya hụ otu nwoke+ guzo n’ihu ya. Nwoke ahụ ji mma agha ọ mịpụtara n’ọbọ ya.+ Joshụa gakwuuru ya, sị ya: “Ị̀ na-akwado anyị, ka ị̀ na-akwado ndị iro anyị?” 14 Nwoke ahụ asị ya: “Abụ m* ọchịagha nke ụsụụ ndị agha Jehova.”+ Joshụa wee gbuo ikpere n’ala, kpọọ isiala, sị ya: “Gịnị ka onyenwe m chọrọ ịgwa ohu ya?”
-