-
Diuterọnọmi 25:5, 6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 “Ọ bụrụ na ụmụnne bikọtara ọnụ, otu n’ime ha anwụọ n’amụtaghị nwa nwoke, nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ agaghị alụ nwoke si n’ezinụlọ ọzọ. Nwanne di ya ga-agakwuru ya, kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye ya ma kuchie ya.+ 6 Nwa nwoke mbụ nwaanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ,+ ka aha ya ghara ifu n’Izrel.+
-