-
1 Samuel 6:5, 6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Unu ga-akpụ ọkpụ ikè na òké+ ndị na-emebi ala unu. Unu ga-akwanyekwara Chineke Izrel ùgwù. Unu mee ihe ndị a, o nwere ike kwụsị ịta unu na chi unu nakwa obodo unu ahụhụ.+ 6 Unu akpọchikwala obi unu otú ndị Ijipt na Fero si kpọchie obi ha.+ Ọ bụ mgbe Chineke mesichara ha ike+ ka ha hapụrụ ndị Izrel, ha alawa.+
-