17 Ugbu a, mara ihe ị ga-eme, n’ihi na ihe a ga-akpatara nna anyị ukwu na ezinụlọ ya niile ọdachi.+ O nweghịkwa onye nwere ike ịgwa nna anyị ukwu okwu maka na ọ bụ nwoke na-abaghị uru ọ bụla.”+
21 Ma, Devid nọ na-ekwu, sị: “Ọ bụ n’efu ka m chere ihe niile nwoke a nwere nche n’ala ịkpa. O nweghị otu n’ime ihe niile o nwere furu efu.+ Ma, o ji ihe ọjọọ kwụọ m ụgwọ ihe ọma.+