19 Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu mere ka unu zuoro ndị iro unu niile gbara unu gburugburu ike n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu,+ unu ga-ekpochapụ ndị Amalek ka a ghara ịnụkwa aha ha n’ụwa.*+ Unu echefula.
3 Gaa gbuo ndị Amalek,+ laakwa ha na ihe niile ha nwere n’iyi.+ Ahapụkwala ha ndụ.* Gbuo ha niile,+ ma nwoke ma nwaanyị, ma nwatakịrị ma nwa ọhụrụ, ma ehi ma atụrụ, ma kamel ma jakị.’”+