13 Gwakwanụ Amesa,+ sị, ‘Ọ̀ bụ na mụ na gị abụghị otu ọbara? Ka Chineke taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike ma ọ bụrụ na mụ emeghị gị onyeisi ndị agha m ka ị nọchie Joab si ugbu a gawa.’”+
10 Ma anya Amesa adịghị ná mma agha Joab ji n’aka. Joab wee were ya maa ya n’afọ,+ eriri afọ ya awụpụtasịa n’ala. Ọ maghịzi ya ọzọ. Otu nke ahụ ọ mara ya gburu ya. Joab na Abishaị nwanne ya nwoke achụrụzie Shiba nwa Bikraị gawa.