-
1 Samuel 18:10, 11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 N’echi ya, Chineke kwere ka mmụọ na-adịghị mma mee ka obi ghara izu Sọl ike,*+ ya ebido na-emegheri emegheri* n’ime ụlọ, ka Devid nọ na-akpọ ụbọ+ otú ọ na-eme n’oge ndị ọzọ. Sọl jikwa ube n’aka.+ 11 Ọ tụkwara ube ahụ,+ na-agwa onwe ya, sị: “M ga-atụgide Devid n’ahụ́ ájá!” Ọ tụrụ ya ube ahụ ugboro abụọ, ma Devid zechara ha ma si ebe ọ nọ gbapụ.
-