-
1 Samuel 13:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Samuel wee sị Sọl: “I zuzuru nzuzu. I debeghị iwu Jehova Chineke gị nyere gị.+ A sị na i debere ya, Jehova gaara eme ka alaeze gị sie ike n’Izrel ruo mgbe ebighị ebi. 14 Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịte aka.+ Jehova ga-achọta nwoke obi ya nabatara.+ Jehova ga-ahọpụtakwa ya ka ọ bụrụ onye ndú nke ndị ya,+ n’ihi na i meghị ihe Jehova gwara gị.”+
-