9 Ọ bụrụ na obi m dị n’ebe nwaanyị ọzọ nọ,+
Ọ bụrụkwa na m gara zoo n’ọnụ ụzọ onye agbata obi m maka na m na-achọ nwunye ya,+
10 Ka nwunye m gweere nwoke ọzọ nri,
Ka ụmụ nwoke ndị ọzọ dinaa ya.+
11 N’ihi na m mee otú ahụ, ọ ga-abụ ihe ihere,
Bụrụkwa ihe ọjọọ nke ndị ikpe ga-eji maka ya taa m ahụhụ.+