1 Samuel 15:27, 28 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 27 Ka Samuel na-atụgharị ịla, Sọl jidere ya n’ala ala uwe ya na-enweghị aka, uwe ahụ adọkapụ. 28 Samuel asị ya: “Jehova anapụla gị ọchịchị Izrel taa otú a i si dọkapụ uwe a. Ọ ga-enyekwa ya onye ka gị mma.+ 1 Samuel 24:17 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 17 Ya asị Devid: “Ị ka m bụrụ onye ezi omume, n’ihi na i meere m ihe ọma, ma m mere gị ihe ọjọọ.+ 1 Samuel 24:20 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 20 Ama m na ị ga-abụrịrị eze,+ nakwa na ọ bụ gị na ezinụlọ gị ga na-achị alaeze Izrel. 1 Samuel 26:25 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 25 Sọl asị Devid: “Ka Chineke gọzie gị, Devid nwa m. Ị ga na-akpa ike. Ihe ga na-agazikwara gị.”+ Devid wee pụwa, Sọl alaghachi n’ụlọ ya.+
27 Ka Samuel na-atụgharị ịla, Sọl jidere ya n’ala ala uwe ya na-enweghị aka, uwe ahụ adọkapụ. 28 Samuel asị ya: “Jehova anapụla gị ọchịchị Izrel taa otú a i si dọkapụ uwe a. Ọ ga-enyekwa ya onye ka gị mma.+
25 Sọl asị Devid: “Ka Chineke gọzie gị, Devid nwa m. Ị ga na-akpa ike. Ihe ga na-agazikwara gị.”+ Devid wee pụwa, Sọl alaghachi n’ụlọ ya.+