25 Absalọm họpụtara Amesa+ ka ọ nọchie Joab+ bụ́ onyeisi ndị agha. Amesa bụ nwa otu nwoke aha ya bụ Itra onye Izrel. O nwere mgbe nwoke a na Abigel dinara.+ Abigel a bụ nwa Nehash, bụrụkwa nwanne Zeruya, nne Joab.
13 Gwakwanụ Amesa,+ sị, ‘Ọ̀ bụ na mụ na gị abụghị otu ọbara? Ka Chineke taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike ma ọ bụrụ na mụ emeghị gị onyeisi ndị agha m ka ị nọchie Joab si ugbu a gawa.’”+