5 Mgbe Eze Devid ruru Bahurim, ọ hụrụ otu nwoke, onye ezinụlọ Sọl hà. Aha ya bụ Shimiaị,+ nwa Gira. Nwoke ahụ nọ na-aga Devid nso, na-eti mkpu, na-akpọ ya iyi.+
8 “Shimiaị nwa Gira, onye ebo Benjamin nke si Bahurim, bi gị nso. Ọ bụ ya kpọrọ m iyi ma kparịa m ezigbo mkparị+ n’ụbọchị m na-aga Mahaneyim.+ Ma mgbe ọ bịara zute m n’Osimiri Jọdan, m ji aha Jehova ṅụọrọ ya iyi na m gaghị egbu ya.+