-
1 Ndị Eze 2:31, 32Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
31 Eze gwaziri ya, sị: “Mee otú ahụ o kwuru. Gaa gbuo ya, liekwa ya, ka ọbara ndị aka ha dị ọcha o gburu* ghara ịdị n’isi mụ na ezinụlọ nna m.+ 32 Jehova ga-emekwa ka ọbara ya dịrị ya n’isi, n’ihi na ọ gara jiri mma agha gbuo mmadụ abụọ ka ya mma, ndị na-emekwa ezi omume karịa ya. Ọ gwaghịkwa Devid nna m na ọ ga-egbu ha. O gburu Abna+ nwa Nee, onyeisi ndị agha Izrel,+ nakwa Amesa+ nwa Jita, onyeisi ndị agha Juda.+
-