3Solomọn na Fero eze Ijipt gọrọ ọgọ. Ọ gara lụrụ nwa Fero,+ kpọlatakwa ya n’Obodo Devid+ ka ọ nọrọ ebe ahụ ruo mgbe ọ ga-arụcha ụlọ nke ya,+ na ụlọ Jehova,+ nakwa mgbidi ga-agba Jeruselem gburugburu.+
11 Solomọn sikwa n’Obodo Devid kpọpụta nwa Fero+ ma kpọga ya n’ụlọ ọ rụụrụ ya.+ Ọ sịrị: “N’agbanyeghị na ọ bụ nwunye m, o kwesịghị ibi n’ụlọ Devid eze Izrel, maka na ebe ọ bụla e bubatara Igbe Jehova dị nsọ.”+