-
2 Ndị Eze 25:17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Ogo nke ọ bụla n’ime ogidi ndị ahụ dị kubit* iri na asatọ.+ E jikwa ọla kọpa kpụọ ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi nke mbụ. Ogo ihe a a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ dị kubit atọ. E jikwa ọla kọpa kpụọ ihe yiri ihe a kpara akpa+ na ihe yiri mkpụrụ pomigranet ndị e ji gbaa ihe ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ gburugburu. Otú a ogidi nke mbụ dị, ka nke abụọ dịkwa.
-
-
2 Ihe E Mere 3:16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Ọ rụkwara ụdọ ígwè nke yiri ihe olu ma konye ha n’elu ogidi ndị ahụ. Ọ kpụkwara otu narị (100) ihe yiri mkpụrụ pomigranet ma ganye ha n’ụdọ ígwè ndị ahụ.
-
-
Jeremaya 52:22, 23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 E jikwa ọla kọpa kpụọ ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ. Ogo otu n’ime ihe ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ dị kubit ise.+ E ji naanị ọla kọpa kpụọ ihe a kpara akpa nakwa ihe yiri mkpụrụ pomigranet ndị e ji gbaa ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ gburugburu. Otú ogidi nke mbụ dị ka nke abụọ dịkwa. Otú ahụ ihe ndị ahụ yiri mkpụrụ pomigranet dị n’ogidi nke mbụ ka ha dịkwa n’ogidi nke abụọ. 23 Ihe ahụ niile yiri mkpụrụ pomigranet ndị dị gburugburu ihe ahụ a kpara akpa dị otu narị (100).+ Ma, ndị nke a na-ahụ anya dị iri itoolu na isii.
-