-
2 Ihe E Mere 6:18-21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 “Ma Chineke ọ̀ ga-eso ụmụ mmadụ biri n’ụwa n’eziokwu?+ Eluigwe, ya bụ, eluigwe niile, enweghị ike ịba gị,+ ma ya fọdụzie ụlọ a m rụrụ.+ 19 Jehova bụ́ Chineke m, biko, gee ntị n’ekpere ohu gị na-ekpe nakwa n’arịrịọ ọ na-arịọ ka i meere ya amara. Nụkwa ákwá ohu gị na-ebesara gị ka i nyere ya aka na ekpere ọ na-ekpe n’ihu gị. 20 Biko, ka anya gị dịrị n’ụlọ a ehihie na abalị, n’ebe a i kwuru na a ga-anọ na-eto aha gị.+ Geekwa ntị n’ekpere ohu gị chere ihu ebe a na-ekpe. 21 Biko, nụrụ arịrịọ ohu gị na-arịọ gị ka i nyere ya aka, nụrụkwa nke ndị Izrel bụ́ ndị gị ga-arịọ gị mgbe ha chere ihu ebe a+ kpee ekpere. Nọrọ n’eluigwe ebe i bi+ nụ ya. Biko, nụ ya ma gbaghara.+
-