-
1 Samuel 9:6, 7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Ma onye na-ejere ya ozi sịrị ya: “Onye nke Chineke nọ n’obodo dị nso ebe a. Ọ bụ nwoke a na-akwanyere ùgwù. Ihe niile ọ na-ekwu na-emezu.+ Ka anyị gaa ebe ahụ ugbu a. O nwere ike ịgwa anyị ihe anyị ga-eme.” 7 Ma Sọl gwara onye na-ejere ya ozi, sị: “Ọ bụrụ na anyị agaa, gịnị ka anyị ga-enye nwoke ahụ? Achịcha agwụla n’akpa anyị. Ọ dịghị ihe anyị ga-enye onye nke ezi Chineke. Gịnị ka anyị ji anyị ga-enye ya?”
-