25 Oké ụnwụ+ mechara daa na Sameria. Ndị Siria nọchibidokwara ya ruo mgbe otu isi jakị+ dara mkpụrụ ego ọlaọcha iri asatọ, otu ụzọ n’ụzọ anọ kab* nsị nduru adaakwa mkpụrụ ego ọlaọcha ise.
28 Eze jụkwara ya, sị: “Gịnị bụ nsogbu gị?” Ya asị: “Nwaanyị a sịrị m, ‘Weta nwa gị ka anyị rie taa, o ruo echi, anyị erie nwa nke m.’+29 N’ihi ya, anyị siri nwa m rie.+ N’echi ya, mụ asị ya, ‘Weta nwa gị ka anyị rie.’ Ma o zoro nwa ya.”