-
1 Ndị Eze 21:19-24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 Gwa ya, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ kwa i gbuola mmadụ,+ wegharakwa ala ya?”’+ Gwakwa ya, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “N’ebe ahụ nkịta rachara ọbara Nebọt ka nkịta ga-aracha ọbara nke gị.”’”+
20 Ehab wee sị Ịlaịja: “Onye iro m,+ ị̀ chọrọkwala m bịa?” Ya asị ya: “Achọrọla m gị bịa. Chineke kwuru, sị: ‘Ebe ọ bụ na i siri ọnwụ* na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova,+ 21 m ga-eme ka ọdachi dakwasị gị. M ga-ebibi gị. M ga-egbu ma nwa nwoke ọ bụla si n’ezinụlọ gị+ ma onye na-enweghị onye na-enyere ya aka ma onye na-enweghị ume n’Izrel.+ 22 M ga-emekwa ka ezinụlọ gị dịrị ka ezinụlọ Jeroboam+ nwa Nibat na ezinụlọ Beasha+ nwa Ahaịja, n’ihi na ị kpasuola m iwe, meekwa ka ndị Izrel mehie.’ 23 Jehova kwukwara gbasara Jezibel, sị: ‘Nkịta ga-eri Jezibel n’ala dị na Jezril.+ 24 Onye ezinụlọ Ehab ọ bụla nke nwụrụ n’obodo, nkịta ga-eri ozu ya. Onye nke nwụrụ n’ọhịa, nnụnụ ga-eri ozu ya.+
-