30 M ga-ebibi ebe ndị dị elu unu na-anọ efe chi ụgha unu,+ gbutusịakwa ihe unu ji adọsa insens* ma tụsachaa ozu unu n’elu arụsị unu na-adịghị ndụ bụ́ ndị na-asọ oyi.*+ M ga-agbakụta unu azụ maka na unu na-asọ oyi.+
5 “Kama, ihe a ka unu ga-eme ha: Kwatusịanụ ebe ịchụàjà ha, kụtusịanụ ogidi arụsị ha,+ gbutusịanụ ogwe osisi arụsị* ha,+ kpọọkwanụ arụsị ha a pịrị apị ọkụ.+