-
Diuterọnọmi 12:29-31Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ebibi mba ndị unu ga-anapụ ala ha,+ unu ga-ebiri n’ala ha. 30 Ma mgbe o bibichara ha, kpacharanụ anya ka unu ghara ime ihe ndị ha mere. Unu ajụla ase gbasara chi ha, sị, ‘Olee otú mba ndị a si fee chi ha dị iche iche? Anyị ga-emekwa ka ha.’+ 31 Unu emesola Jehova bụ́ Chineke unu otú ahụ n’ihi na ihe ha na-emere chi ha dị iche iche bụ ihe rụrụ arụ Jehova kpọrọ asị. Ha na-akpọdị ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị ọkụ iji chụọrọ chi ha àjà.+
-