-
Ọpụpụ 29:39-41Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
39 Chụọ otu ebule n’àjà n’ụtụtụ, chụọkwa ebule nke ọzọ n’àjà ná mgbede.*+ 40 Ihe ndị ị ga-eji chụọ ebule nke mbụ n’àjà bụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanụ oliv, nakwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin mmanya nke ga-abụ àjà mmanya. 41 Ị ga-achụ ebule nke abụọ n’àjà ná mgbede.* Ị ga-eji àjà ọka na àjà mmanya ga-adị ka nke ụtụtụ chụọ ya. Ị ga-achụ ya n’àjà ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ọma,* bụ́ àjà a na-esu ọkụ nke a na-achụrụ Jehova.
-