10 Ala wee meghee* loo ha. Ma Kora na ndị na-akwado ya nwụrụ mgbe ọkụ regburu narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250).+ Ha wee bụrụ ihe atụ e ji adọ ndị ọzọ aka ná ntị.+11 Ma ụmụ Kora anwụghị.+
11 Ha ga-ata ahụhụ n’ihi na ha sooro ụzọ Ken,+ sorokwa ụzọ ọjọọ Belam+ n’egbughị oge maka na ha chọrọ ka a kwụọ ha ụgwọ. E bibiekwala ha maka na ha kwuru okwu gosiri na ha na-enupụ isi+ ka Kora.+