7 N’ihi ya, ha họọrọ Kidesh+ nke dị na Galili n’ala Naftalaị bụ́ ugwu ugwu, họrọkwa Shikem+ nke dị n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, na Kiriat-aba,+ ya bụ, Hebrọn, nke dị n’ala Juda bụ́ ugwu ugwu.
9 Obodo ndị a ka a họtaara ndị Izrel niile nakwa ndị mbịarambịa ha na ha bi, ka onye ọ bụla gburu mmadụ* n’amaghị ụma gbaga n’otu n’ime ha,+ ka onye na-abọrọ onye ahụ o gburu ọbọ ghara igbu ya tupu nzukọ unu ekpee ya ikpe.+