-
1 Ihe E Mere 6:31-33Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
31 E nwere ndị Devid họpụtara ka ha na-eduzi ndị na-abụ abụ n’ụlọ Jehova mgbe a dọsachara Igbe Chineke n’ụlọ ahụ.+ 32 Tupu Solomọn arụọ ụlọ Jehova na Jeruselem,+ ọ bụ ha na-ahụ maka abụ a na-abụ n’ụlọikwuu, ya bụ, n’ụlọikwuu nzute. Ha nọkwa na-arụ ọrụ a otú a gwara ha ka ha si na-arụ ya.+ 33 Ndị a bụ ndị ha na ụmụ ha na-arụ ọrụ a: A bịa n’ụmụ Kohat, e nwere Himan+ onye ọbụ abụ, nwa Joel+ nwa Samuel
-