-
2 Samuel 6:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Otú ahụ ka ha si si n’ụlọ Abinadab dị n’elu ugwu buru Igbe ezi Chineke pụọ. Ahayo nọkwa na-aga Igbe ahụ n’ihu. 5 Devid na ndị Izrel niile nọkwa na-enwe aṅụrị n’ihu Jehova, jiri ụdị ngwá egwú niile e ji osisi junipa rụọ na-eti egwú. Ha ji ma une ma ụbọ akwara+ ma obere ịgbà+ ma ájà ma ngwá egwú ndị ọzọ.+
-