29 Ọ bụrụ na mmadụ ebilie chụwa gị ọsọ, na-achọkwa igbu gị, Jehova bụ́ Chineke gị ga-echebe gị otú mmadụ si echebe ihe bara ezigbo uru e kechiri n’akpa. Ma ọ ga-agbapụ ndụ* ndị iro gị otú e si eji èbè* agbapụ nkume.*
10 Devid kwukwara, sị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na ma ọ́ bụghị na Jehova ga-eji aka ya gbuo ya,+ ya abụrụ na otu ụbọchị+ ọ ga-anwụ otú ndị ọzọ si anwụ, ma ọ bụkwanụ na ọ ga-aga agha, agha ahụ ataa isi ya.+