34 Ka è nwetụla mgbe Chineke ji ikpe ya, ihe àmà, ọrụ ebube,+ agha,+ aka ya siri ike,+ ike ya, na ihe ndị na-atụ egwu o mere+ gbalịa ka o si ná mba ọzọ kpọpụtara onwe ya otu mba, otú Jehova bụ́ Chineke unu meere unu n’Ijipt n’ihu unu?
10 I wee mee ihe àmà dị iche iche, rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche iji mesie Fero na ndị niile na-ejere ya ozi nakwa ndị ala ya niile ike,+ n’ihi na ị ma na ha mekpara ndị gị ahụ́.+ I meere onwe gị aha nke dị ruo taa.+
9 Ma, ihe mere m ji mee ihe m mere bụ ka a ghara imebi aha m ná mba dị iche iche ha bi.+ N’ihi na m nọ n’ihu mba ndị a mee ka ha* mara m mgbe m si n’Ijipt kpọpụta ha.*+