-
1 Ihe E Mere 29:2-4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Agbakwaala m mbọ otú ike m hà kwakọta ọlaedo maka ihe ndị a ga-eji ọlaedo arụ n’ụlọ Chineke, kwakọtakwa ọlaọcha maka ihe ndị a ga-eji ọlaọcha arụ, nakwa ọla kọpa maka ihe ndị a ga-eji ọla kọpa arụ. Akwakọtakwala m ígwè maka ihe ndị a ga-eji ígwè arụ,+ nakwa osisi+ maka ihe ndị a ga-eji osisi arụ. Ihe ndị ọzọ m kwakọtara bụ nkume ọnịks, nkume a ga-eji ụrọ doo, obere okwute ndị tụrụ àgwà, ụdị nkume ọ bụla dị oké ọnụ,* nakwa nkume alabasta karịrị akarị. 3 Enyekwala m ọlaedo m na ọlaọcha m+ maka ụlọ Chineke m,+ n’ihi na ihe gbasara ụlọ Chineke m masịrị m. Enyekwala m ọtụtụ ihe ndị ọzọ maka ụlọ ahụ dị nsọ. 4 Ụfọdụ n’ime ihe ndị m nyere bụ puku talent* ọlaedo atọ (3,000) si Ofa,+ puku talent ọlaọcha asaa (7,000) a nụchara anụcha a ga-eji machie ahụ́ ụlọ dị iche iche,
-