4 Obed-ịdọm mụrụ ụmụ nwoke ndị a: Shemaya bụ ọkpara ya. Jehozabad bụ nwa ya nke abụọ. Joa bụ nwa ya nke atọ. Seka bụ nwa ya nke anọ. Netanel bụ nwa ya nke ise. 5 Amiel bụ nwa ya nke isii. Ịsaka bụ nwa ya nke asaa. Piuletaị bụ nwa ya nke asatọ. Otú a ka Chineke si gọzie Obed-ịdọm.