-
1 Ihe E Mere 3:1-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Ụmụ ndị a ka a mụụrụ Devid mgbe ọ nọ na Hebrọn:+ ọkpara ya bụ Amnọn.+ Nne Amnọn bụ Ahịnoam+ onye Jezril. Nke abụọ bụ Daniel. Nne ya bụ Abigel+ onye Kamel. 2 Nke atọ bụ Absalọm.+ Nne ya bụ Meaka, nwa Talmaị eze Geshọ. Nke anọ bụ Adọnaịja+ nwa Hagit. 3 Nke ise bụ Shefataya nwa Abaịtal. Nke isii bụ Itriam. Nne ya bụ Egla, nwunye Devid. 4 Ụmụ isii a ka a mụụrụ ya na Hebrọn. Ọ nọ ebe ahụ chịa afọ asaa na ọnwa isii, nọrọkwa na Jeruselem chịa afọ iri atọ na atọ.+
5 Ndị a ka a nọ na Jeruselem mụọrọ ya:+ Shimia, Shobab, Netan,+ na Solomọn.+ Ọ bụ Bat-shiba+ nwa Amiel mụrụ ha anọ. 6 Ụmụ nwoke itoolu ọzọ Devid mụrụ bụ: Ịbha, Elishama, Elifelet, 7 Noga, Nifeg, Jefaya, 8 Elishama, Elayada, na Elifelet. 9 Ndị a niile bụ ụmụ nwoke Devid mụrụ, n’agụnyeghị ndị nke ndị iko ya mụụrụ ya. Nwanne ha nwaanyị bụ Tema.+
-