12 Mgbe Absalọm chụrụ àjà ndị ahụ, o ziri ozi ka a kpọọrọ ya Ahitofel+ onye Gaịlo, onye ndụmọdụ Devid,+ ka o si n’obodo ya bụ́ Gaịlo+ bịa. Nkata ọjọọ Absalọm kpara nọ na-agaziri ya, ndị na-akwado ya nọkwa na-adịkwu ọtụtụ.+
23 Mgbe Ahitofel hụrụ na e meghị ihe ọ tụrụ aro ka e mee, o dokwasịrị ihe a na-eji anọkwasị na jakị, gbara ya laa n’ụlọ ya dị n’obodo ha.+ Mgbe ọ gwachara ndị ezinụlọ ya ihe ha ga-eme,+ ọ kwụgburu onwe ya.+ Otú a ka o si nwụọ. E likwara ya ebe a na-eli ndị ezinụlọ ha.