16 Mgbe Hushaị+ onye Akaịt,+ enyi Devid, bịakwutere Absalọm, ọ sịrị Absalọm: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!+ Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!” 17 Absalọm ajụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ otú a ka i si egosi enyi gị na ị hụrụ ya n’anya? Gịnị mere na i soghị enyi gị gbapụ?”