6 Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike.+ Unu atụla ha egwu, unu atụkwala ha ụjọ,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu so unu na-aga. Ọ gaghị ahapụ unu, ọ gaghịkwa agbakụta unu azụ.”+
9 Ọ̀ bụ na mụ agwabeghị gị ka i nwee obi ike, ka ị dịkwa ike? Amala jijiji, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị ebe ọ bụla ị na-aga.”+