-
2 Ndị Eze 12:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Ha na-ewerekwa ya nye ndị a họpụtara ka ha na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova. Ndị ahụ na-ewerezi ya kwụọ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ Jehova+ ụgwọ, ma ndị na-arụ ọrụ ndị e ji osisi arụ ma ndị na-arụ ụlọ, 12 ma ndị na-edo nkume ma ndị na-awa nkume. Ha na-ejikwa ya azụ osisi na nkume a wara awa ka e jiri rụzie ebe ndị mebiri emebi n’ụlọ Jehova. Ha na-ejikwa ego ahụ eme ihe ndị ọzọ niile gbasara ịrụzi ụlọ ahụ.
-