-
Ọpụpụ 37:25, 26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 O wee jiri osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà insens.+ O nwere akụkụ anọ há nhata. Ọ dị otu kubit n’ogologo, otu kubit n’obosara, na kubit abụọ n’ịdị elu. A rụkọtara ahụ́ ya na mpi ndị dị na ya ka ha bụrụ otu.+ 26 O ji ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya, ma elu ya ma akụkụ ya niile gbaa gburugburu ma mpi ndị dị na ya. O jikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.
-